Nkuwuwaputa Uwa Nile Banyere Ikike Mmadu Nwegasiri
p. 33-43
Texte intégral
Okwu mmalite
1Ebe o bu na nghota ugwu ekere uwa na ikike nha anya a pughi inapu mmadu nke diri onye o byla bi n'uwa bu ntuala nke inwere onwe, ikpe nkwumoto na udo n'elu uwa.
2Ebe nleghara anya na nleli ikike mmadu nwegasiri emeela ka e nwee akparamagwa enweghi uche nke gbawara obi mmadu nile, a biakwa obibia uwa ebe ndi mmadu ga-enwejuputa ohere ikwu okwu na inwe nkwenye nakwa nlihapu n'ujo na uko, аburu ihe a mаrа n'okwa di ka olile anya kachasi ibe ya nke mmadu nkiti.
3Ebe o di mkра, mа о buru na a choghi ikwanye mmadu ka о were оkе nnupu isi sogide ochichi aka ike na mmegbu di ka ihe ikpeazu o рuru ime, na a ga-echedo ikike mmadu nwegasiri site n'usoro iwu.
4Ebe o di mkpa ikwalite oganihu mmekorita enyi na enyi n'etiti mba na ibe ya.
5Ebe ndi otu jikotara mba uwa nile bu United Nations, n'ime Chata bu akwukwo nyere ha ike kwuputakwara ozo okwukwe ha n'ikike ntoala mmadu nwegasiri, n'ugwu na uru nke mmadu, ya na nha anya ikike ndi diri nwoke na nwanyi, were nweekwa njikere ikwalite oganihu obodo na ezi obibi ndu nke ndi mmadu nweere onwe ha.
6Ebe mba ndi no n'otu a eweputala onwe ha maka inweta, site na njiko aka ha na United Nations, nkwalite nsopuru n'uwa nile na idebe iwu gbasara ikike na ohere ntoala mmadu nwegasiri.
7Ebe nghota onye o bula banyere ikike na ohere ndi a kachasi diri mkpa maka imejuputa nkwekorita nke a.
UGBU A ZI
8Ogbako ozuzu a bu General Assembly Na-akwado Nkuwuwaputa Uwa Nile nke a banyere Ikike Maadu Nwegasiri ka o buru ihe ngosi oganihu nke ndi mmadu nile na mba nile, nke bu na onye o bula nakwa ngalaba o bula nke obodo bu Nkwuwaputa a n'obi, ga-agbasi mbo ike, site na nkuzi na ozuzu, ikwalite nsopuru maka ikike na ohere ndi a, ma sitekwa n'atumatugasi nke mba na nke jikoro mba na mba na-aga n'ihu ime ka a ghtachaa ma debechaa ha n'uwa nile ma n'ime mba ndi no n'otu a makwa n'ime mba ndi ozo no n'okpuru ochichi ha.
Nkeji edemede 1.
9A muru mmadu nile n'ohere nakwa nha anya ugwu na ikike. E nyere ha uche na mmuo ime ihe ziri ezi nke na ha kwesiri ikpaso ibe ha agwa n'obi nwanne na nwanne.
Nkeji edemede 2
10Onye o bula tozuru iwe ikike na ohere nile e weputara na Nkwuwaputa nke a , n'enweghi ikpa oke o bula di ka nke agburu; ucha akpykpo ahu, ibu nwoke ma o bu nwanyi, asysy, okpukpe chi, echiche banyere ochichi ma o bu ihe ozo, obodo ma o bu o n'obodo aku, onodu omumu ma o by onodu ozo. Ozokwa, a gaghi enwe ikpa oke gbadoro ykwy n'onody ochichi, nlekota ma o by mmekorita mba na mba, nke obodo ma o by oke a la onye no na ya, n'agbanyeghi ma ebe ahy o nwe onwe ya, o no na nlekota anya, o no n'okpuru ochichi ozo ma o nwere ihe ozo gbochiri ya inwe ntozu oke di ka mba.
Nkeji edemede 3
11Onye o bula nwere ikike inwe ndy, ohere na nchedo nke onwe ya.
Nkeji edemede 4
12O dighi onye a ga-ejigide n'onodu ohu ma o bu odibo a ga-amachi ikpa ma o bu ire ohu n'udi o bula.
Nkeji edemede 5
13O dighi onye a ga-akwagide n'oke ntaramahyhy, ma o by na mmeso omume na ntaramahuhu obi ojoo, obi tara mmiri ma o bu nke naz-ewetu ugwu mmadu.
Nkeji edemede 6
14Onye o bula nwere ikike nkwanyere ugwu di ka mmadu ebe о bulа n'usoro iwu.
Nkeji edemede 7
15Madu nile ha otu n'usoro iwu, tozukwa oke n'enweghi ikpa оkе о bula inweta nchedo nha anya n'usoro iwu. Madu nile tozukwara oke nchedo nha anya megide udi ikpa oke o bula mebiri Nkwuwaputa nke a ma megidekwa ikwanye mmadu 0 bula n'udi ikpa oke a.
Nkeji edemede 8
16Onye o bulа nwere ikike ikpe mmezi ga-enwe nkawado oha na eze nke ndi ulo ikpe tozuru etozu nke obodo ma e nwee omume ndi megidere ikike ntoala nke e nyegasiri ya site n'usoro ochichi ma о bu iwu.
Nkeji edemede 9
17O dighi onye a ga-akwagide na njide n'efu, mkpochi ma o bu nсhupu n'obodo ya.
Nkeji edemede 10
18Onye o Ьulа nwere ntozu oke nha anya icho ikpe ziri ezi n'ihu oha nke ulo ikpe nwere onwe ya ma kwurukwa n'ezi okwu, na mkepebi ikike ndi о nwegasiri na ihe ndi о tosiri ime nakwa ebubo imebi iwu o bulа e boro ya.
Nkeji edemede 11
- - Onye O bula e boro ebubo ida iwu nwere ntaramahuhu tosiri ka e kwenye na o nweghi uta tutu a choputa na uta diri ya n'usoro iwu, n'ikpe e kpere n'ihu oha, ebe e nyere ya ohere nile di mkpa maka iji zara onu ya.
- - O dighi onye a ga-ama ikpe ida iwu o bula nwere ntaramahuhu maka ihe o mere ma o bu ihe o hapuru ime nke n'abughi ida iwu nwere ntaramahuhu n'oge e mere ya, ma o bu n'usoro iwu obodo ma O bu nke di, n'etiti mba na mba. N'otu aka ahu, a gaghi enye mmadu ntaramahuhu kariri nke a na-enye n'oge a dara iwu ahu nwere ntaramahuhu.
Nkeji edemede 12
19O dighi onye a ga-akwagide na nnyonye anya ezighi ezi n'ihe o-coghi ka oha mara, ezinulo ya, ulo ya ma o bu nzikorita ozi ya, ma o bukwa na mbuso agha megide ugwu na ezi aha ya. Onye O bula newere ikike icho nchedo iwu megide nnyonye anya ma o bu mbuso agha ndi a.
Nkeji edemede 13
- -Onye o bula nwere ikike ohere ngaghari na nke obibi n'ime oke ala nke Steti o bula.
- - Onye o bula nwere ikike ihapu ala o bula, tiyere ala nke ya, ma nweekwa ikike iloghachi n'ala ya.
Nkeji edemede l4
- - Onye o bula nwere ikike icho ma nwetakwa n'ala ozo gasi ebe mgbanahu mkpagbu.
- - A gaghi akpoku ikike a n'ihe gbasara agbamakwukwo sitere ezie na mmebi iwu n'abughi nke ndorondoro ochichi ma o bu omume megidere ebumnuche na usoro nke United Nations.
Nkeji edemede l5
- - Onye o bula nwere ikike ibu nwa afo n'ala ya.
- - O dighi onye a ga-esi n'uzo na-edoghi anya napu obubu nwa afo ya ma o bu napu ikike igbanwe ala o nwa afo na ya.
Nkeji edemede 16
- - Umu nwoke na umu nwanyi toruru ogo, n'enweghi ihe njigide o bula site n'agburu. obubu nwa afo ma o bu okpukpere chi, nwere iki ilu nwunye ma o bu di nakwa imalite ezi na ulo nwere ikike nha anya n'ihe gbasara olulu di na nwunye, obibi di na nwunye na mgbasa ya.
- -Olulu di na nwunye ga-aburiri ma e nwere nkwekorita si n'obi zuru oke nke ndi choro ilu onwe ha.
- - Ezi na ulo bu nkeji ntaoala site n'okike nke ndi no n'obodo o bula; n'ihi ya, o kwesiri inwe nchedo ndi obodo na nke Steti.
Nkeji edemede 17
- -Onye o bula nwere ikike inwe ihe nke aka ya ma o bu ya na ndi ozo inwekorita ihe.
- -O dighi onye a ga-esi n'uzo na-edoghi any nарu ihe о nwere.
Nkeji edemede l8
20Onye o bulа nwere ikike echiche, mmuo na okpukpere chi masiri ya ikike a gbakwunyere ohere igbanwe okpukpere chi ma o bu nkwenye ya, na ohere nke soso ya ma o bu ya na ndi ozo nwere n'ogbo oha ma o bu na nzuzo, igosiwaputa okpukpere chi ma o bu nkwenye ya site na nkuzi, omume, ofufe na ndebe iwu.
Nkeji edemede l9
21Onye o bula nwere ohere uche aka ya na nkwuputa uche yâ ikike a gbakwunyere ohere ikwudo n'echiche n'enweghi nnyonye anya na nke icho, inata na igbasa ozi na echiche site n'uzo o bula n'agbanyeghi oke ala.
Nkeji edemede 20
- -Onye o bula nwere ikike iji aka ya soro n'ogbako na otu.
- - O dighi onye a da-amanye isoro n'otu o bula.
Nkeji edemede 21
- -Onye o bula nwere ikike iso n'ochichi obodo ya, n'onwe ya ma o bu site na ndi nnochite anya a hoputara n'enweghi mmanye.
- -Onye o bulа nwere ike nha anya inwete oru obodo na ala ya.
- - Uche oha na eze ga-abu ihe mgbakwasi ukwu nke ike ochichi obodd A ga-egosiputa uche nke a site n'ezi ntuli aka a ga na-eme kwa mgbe nke onye o bula nwere ikike nha anya iso mee n'uzo nzuzo ma o bu n'uzo ndi ozo ga-enyekwa ya ohere ituliri onye masiri ya aka.
Nkeji edemede 22
22Onye o bu lan, n'onodu ya di ka onye obodo, nwere ikike inweta nchedo obodo ma tozukwa oke inweta, site n'agbamdo obodo ya na enyemaka mba ndi ozo di ka nhazi na aku na uba Steti o bula siri di, ikike sitere n'aku na uba, onodu n'obodo na omenala, bu ikike ndi di oke mkpa mu ugwu ya na ohere ntozu oke ya di ka mmadu.
Nkeji edemede 23
- -Onye o bula nwere ikike iru oru, iji aka ya horo oru o ga-aru, ino n'onodu oru ndi ruuru ya ma dikwa mma, na inweta nchedo site n'onodu enweghioru
- - Onye o bula, n'enweghi ikpa oke o bula, nwere ikike inata ugwo nha anya kwesiri oru ya.
- -Onye o bula na-aru oru nwere ikike inata akwumugwo ruuru ya ma dikwa mma nke ga-eme ka ya na ezi na ulo ya nwee obidi ndu kwesiri ugwu mmadu, nke a gbakwunyere, ma o di mkpa, ihe ndi ozo e ji echedo ndu n'obodo.
- - Onye o bula nwere ikike imalite na ibanye n'otu ndi oru maka nchedo ihe ndi gbasara ya.
Nkeji edemede 24
23Onye o bula nwere ikike ezumike na oge ezumike, tinyere mkpebi doro anya nke oge oru ya na oge ezumike n'afo nke ikwu ugwo ga-esokwa.
Nkeji edemede 25
- - Onye o bula nwere ikike ino n'obibi ndu tosiri etosi maka ahu ike na odimma nke ya na nke ezi na ulo ya tinyere nri, uwe, ebe obibi na nlekota ahu ike na enyemaka di iche iche nke obodo, ya na ikike inwe nlekota obodo n'onodu enweghi oru, oria, nkwaru, isi mkpe, nka ma o bu onodu ezughi oke ozo nke o na-apughi igbochite.
- - Onodu nne na nke nwata kwesiri inwe mkpachapuru anya na enyemaka puru iche. Umuaka nile, ma a muru ha n'alumdi na nwuye ma a mughi, ga-enwe otu udi nchedo obodo a.
Nkeji edemede 26
- - Onye o bula nwere ikike inweta ozuzu. Ozuzu ga-abu n'efu, o kacha n'oge mmalite bukwa oge ntoala ya. Ozuzu umuntakiri ga-abu manye. Ozuzu nka na uzu na nke oru aka ga-adi maka onye o bula choro ha; ozuzu di elu ga-erukwa onye o bula aka n'usoro onye jiri tozuo maka ya.
- - Ozuzu ka a ga-eji sogide nkwalite ntozu oke nke mmadu na kwadosi ike nke nsopuru maka ikike na ohere ntoala mmadu nwegasiri. O ga-akwalite nghota, ndidi na adimnamma n'etiti mba, agburu ma o bu otu okpukpere chi nile, ma kwalitekwa emereme nile nke United Nations na-eme ka udo diri.
- -Nne na nna nwere ikike izizi ihoro udi оzuzu a ga-enye umu ha.
Nkeji edemede 27
- -Onye o bula nwere ikike iji aka ya soro n'emume odinala nke obodo, iri uru nke mmuta nka nakwa iketa оkе n'oganihu na uru nke mmuta sayensi.
- - Onye o bula nwere ikike nchedo uru ndi a huru anya na ndi a hughi anya sitere na mmeputa nke sayensi, edemede ma o bu nka, nke e si n'aka ya n weta.
Nkeji edemede 28
24Onye o bula tozuru оkе inwe nbazi ime obodo na nke jikotara mba na ibe ya, nke ga-ekwe ka ikike na ohere ndi e gosiputara na Nkuwuwaputa a zuo ezuo.
Nkeji edemede 29
- -Onye o bula nwere oru ndi o tosiri iruru obodo ya bu nani ebe ntozu оkе mmadu nke o choro ga-esi puta.
- - Na ngosiputa ikike na ohere ndi o nwegasiri, onye o bula ga-enwe nrube isi nye soso mmachi ndi sitere n'usoro iwu a mara iji mee ka e nweta ezi nghota na nsopuru ikike na ohere ndi ozo nwegasiri na iji nweta ezi ihe mgnakwasi ukwu maka ezi mkparamagwa, ndebe iwu oha na odi mma mmadu nile no n'obodo onye kwuo uche-ya.
- - A gaghi egosiputa ikike na ohere ndi a n'uzo o bula ha ga-esi megide ebumnuche na usoro iwu nke United Nations.
Nkeji edemede 30
25Onweghi ihe no na Nkuwuwaputa nke a a ga-akowa di ka ihe nyere Steti, otu ma o bu mmadu o bula ikike o bula itinye aka na emereme o bula ma o bu ime omume o bula iji mebi ikike na ohere o bula ndi a kowaputara n'ebe a.
Le texte seul est utilisable sous licence Licence OpenEdition Books. Les autres éléments (illustrations, fichiers annexes importés) sont « Tous droits réservés », sauf mention contraire.
Universal Declaration of Human Rights: English, French, Hausa, Igbo and Yoruba
Foreword by Wole Soyinka
1993
Creative writing, writers and publishing in Northern Nigeria
Abba Aliyu Sani, Jibrin Ibrahim et Emmanuel Babatunde Omobowale
1997
Archaeological investigation of Itagunmodi potsherd pavement site, Ijesaland, Osun State, Nigeria
1991-1992 season
Babatunde Agbaje-Williams
1995
Guerre et société au royaume de Fetu
Des débuts du commerce atlantique à la constitution de la fédération fanti (Ghana, Côte de l’or, 1471-1720)
Yann Deffontaine
1993